Onyeisi lig ndi na erubeghi afọ iri na asaa nke ndi NPFL na ahazi, Mazi Emeka Inyama etoola nwokoro na asunyere ndi Abia Warriors gol, George Bassey, maka mgbalị ya na okwe nke mbụ ha na ndị Enyimba gbara na asoroma mpi ndi n’erubeghi afọ iri na asaa nke ana agba na Enugu.

Enyimba na Abịa Warriors nyeritara onwe ha ọkpụ gol abụọ. Ọbụ George sunyere gol abụọ ndi Abia Warriors. Mgbe ọ na agwa ndi nta akụkọ okwu, Iyama kwuru na Bassey bụ mkpụrụ ọma ekwesiri ichekwa ka akụ dị oke ọnụ ahia.

“Otú nwokoro a si gbaa bọọlụ ebea gosiri na oji obi ya niile mee ihe. Otu o si ejide bọọlụ, obi ike ya na igbata bọọlụ ya bụ ihe kwesịrị ịkpọrọ mmasị anyị. O mere nke ọma site na isụnye gol abụọ.”

Ka ọ dị, ndị Heartland ji okpu gol atọ na asataghi otu menyuo ndi Abia Warriors anya na okwe bọọlụ nke abụọ ha gbara na ụtụtụ Fraide.

Tony Ademodi dere ya ma Bethel Kalu sughariri ya na asụsụ Igbo

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *